1 Chronicles 14

Ezinaụlọ Devid

1Hiram bụ eze Taịa zitere Devid ndị ozi, na ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-edo nkume, ka ha nyere Devid aka iwu ụlọeze ya. O nyekwara ya osisi sida o ji ewu ụlọ ahụ. 2Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel, na ebuliela alaeze ya elu nke ukwuu nʼihi ndị ya Izrel.

3Devid lụrụ ndị inyom ọzọ mgbe o jere biri na Jerusalem. Nke a mere ka ọ mụọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị. 4Ndị a bụkwa aha ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn, 5Ibha, Elishua, Elpelet, 6Noga, Nefeg, Jafia, 7Elishama, Beeliada na Elifelet.

Devid emerie ndị Filistia

8Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel niile, ha pụrụ nʼigwe ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, jikere pụọ izute ha. 9Ma ndị Filistia bịara, bukọrọ ihe niile dị na Ndagwurugwu Refaim. 10Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?”

Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.”

11Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim. 12Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ.

13Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ. 14Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ. 15Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-apụ ibu agha, nʼihi na nke a pụtara na Chineke eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.” 16Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza.

17Ya mere, aha Devid bidoro na-ewu ewu; Onyenwe anyị tinyekwara ụjọ ya nʼobi mba niile.

Copyright information for IboBIU